Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. TIMỌTI 2:7-19

II. TIMỌTI 2:7-19 IGBOB

Nātughari uche n'ihe m'nēkwu; n'ihi na Onye-nwe-ayi gēnye gi nghọta n'ihe nile. Nēcheta Jisus Kraist, dika Onye emeworo ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye si na nkpuru Devid puta, dika ozi ọmam si di: nke m'nāhuju anya nime ya rue ab͕u, dika onye nālu ọlu ọjọ; ma ekeghi okwu Chineke ab͕u. N'ihi nka ka m'nwere ntachi-obi n'ihe nile n'ihi ndi arọputara, ka ha onwe-ha we ru kwa nzọputa nke di nime Kraist Jisus, ya na ebube ebighi-ebi. Okwu a kwesiri ntukwasi-obi: N'ihi na asi na ayi soro Ya nwukọ ọnwu, ayi gēso kwa Ya dikọ ndu: asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe-ya gāgọnari kwa ayi: asi na ayi ekweghi ekwe, Ya onwe-ya nānọgide n'ikwesi ntukwasi-obi; n'ihi na Ọ pughi igọnari Onwe-ya. Nēchetara ha ihe ndia, nāgwasi ha ike n'iru Onye-nwe-ayi, ka ha ghara ise okwu bayere okwu efu, bú ihe nābaghi n'ihe, nēkpù ndi nānu anu iru. Nānu ọku n'obi iche onwe-gi n'iru madu dika onye Chineke nwaputaworo, onye-ọlu nke ihere nāpughi ime ya, onye nēkwuzi okwu nke ezi-okwu ahu. Ma nēze okwu efu nile emeruru emeru: n'ihi na ha gāga kari n'iru n'asọpurughi-Chineke, okwu-ha gābu kwa ọnyá nāba aba dika gangrene: ndi Haimeniọs na Filitọs di n'etiti ha; bú madu ndi hiere n'ihe bayere ezi-okwu ahu, nāsi na nbilite-n'ọnwu agabigawo ub͕u a, ha nēkpù kwa okwukwe madu ufọdu iru. Otú ọ di, ntọ-ala di ike nke Chineke nēguzo, ebe o nwere akàrà nka, Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya: na, Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n'ajọ omume wezuga onwe-ya.