Ma nime ulo uku ọ bughi nání ihe ọla-edo na ihe ọla-ọcha di, kama ihe osisi na ihe ájá di kwa; e mekwara ufọdu ka ha buru ihe-nsọpuru, me kwa ufọdu ha na buru ihe-ihere. Ya mere ọ buru na onye ọ bula asacha onwe-ya pua n'ihe ndia, ọ gābu ihe emere ka ọ buru ihe-nsọpuru, ihe edoworo nsọ, ihe bara n'ihe ka Onye-nwe-ya were ya me ihe, ihe edoziworo iji lu ezi ọlu nile ọ bula. Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha. Ma nāju iju-ajuju nzuzu na nke amaghi-ihe, ebe i matara na ha nāmuputa ilu-ọ̀gù. Ma orù nke Onye-nwe-ayi aghaghi ibu onye nādighi-alu ọ̀gù, kama ọ ghaghi idi nwayọ n'ebe madu nile nọ, ọ ghaghi kwa ibu onye nwere ike izí ihe, onye nānagide ihe ọjọ, n'idi-nwayọ nādọ ndi nēdo onwe-ha imegide ya aka na nti; ma asi na ọ bu ezie ma eleghi anya na Chineke gēnye ha nchèghari ka ha we mazu ezi-okwu, we teta n'ura manya pua n'ọnyà ekwensu, ebe orù Onye-nwe-ayi nwudeworo ha na ndu ka ha me ihe Chineke nāchọ.
Gụọ II. TIMỌTI 2
Geere nke a ntị II. TIMỌTI 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. TIMỌTI 2:20-26
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị