Ya mere, gi onwe-gi, nwam, ka eme ka i di ike n'amara nke di nime Kraist Jisus. Ihe nile i nukwara n'ọnum site n'etiti ọtutu ndi-àmà, nye ihe ndia n'aka madu ndi kwesiri ntukwasi-obi idebe, bú madu ndi ọ gēkwe kwa izí madu-ibe-ha ihe ndia. Som hujukọ anya, dika onye-agha ọma nke Kraist Jisus. Ọ dighi onye-agha ọ bula nātuhi onwe-ya n'ihe nke ibi-obi a mb͕e o nēbu agha; ka o we me ihe gātọ onye dere aha-ya n'akwukwọ dika onye-agha. Ma ọ buru kwa na onye ọ bula nāb͕a nb͕a, ekpughi ya okpu-nmeri, ma ọ buru na ọ b͕aghi nb͕a otú ọ di n'iwu. Onye-ọlu-ubi nke nādọb͕u onwe-ya n'ọlu aghaghi ibu uzọ kère òkè na nkpuru-ya. Nātughari uche n'ihe m'nēkwu; n'ihi na Onye-nwe-ayi gēnye gi nghọta n'ihe nile.
Gụọ II. TIMỌTI 2
Geere nke a ntị II. TIMỌTI 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. TIMỌTI 2:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị