N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere, N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè; N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á. I gāzọputa kwa ndi ewedara n'ala: Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala. N'ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova: Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu. N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe: Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi. Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya. N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova? Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi? Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku: Ọ nākwazu kwa uzọm. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam. O nēzí akam abua ibu agha; Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba. I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum, Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa. Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha; Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia. M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa: Ha we da n'okpuru ukwum abua. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha: I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum. Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha, Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha. Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha; N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha. Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala, Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha. I we me ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdebem ka m'buru isi mba nile ọzọ: Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè. Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum: Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti. Ndi ala ọzọ nāta aru, Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n'ebe-nmechibido-ha puta. Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa; Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu: Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum, Onye nēme kwa ka m'si n'aka ndi-irom pua: I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem: I nānaputam n'aka madu nēme ihe ike. N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba ọzọ, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma. Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku: Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere, Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi.
Gụọ II. SAMUEL 22
Geere nke a ntị II. SAMUEL 22
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. SAMUEL 22:26-51
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị