II. SAMUEL 22:21-25
II. SAMUEL 22:21-25 IGBOB
Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di: Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ. N'ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova, Emebighkwam iwu n'ipu n'aka Chinekem. N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum: Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga onwem n'ebe ha di. M'we zue okè n'ebe Ọ nọ, Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajọ omumem. Jehova we meghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcham n'anya-Ya si di.

