Ma okwu Joram nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Joram we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya. N'arọ nke-iri-na-abua nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, ka Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, malitere ibu eze. Orú arọ na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem. Ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri, bú eze Israel. O we je ije n'uzọ ulo Ehab, me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n'ihi na nwa nwa ulo Ehab ka ọ bu. O we soro Joram nwa Ehab ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram. Eze, bú Joram, we lata ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u ndi Siria tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Joram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.
Gụọ II. NDI-EZE 8
Geere nke a ntị II. NDI-EZE 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI-EZE 8:23-29
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị