O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi. Ọ si, Jehova nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, m'gaghi-anara ihe ọ bula ma-ọli. O we rugide ya inara ya; ma ọ juru aju. Neaman we si, Ọ buru na i naghi, biko, ka enye orù-gi ibu ájá nke inyinya mule abua gēbu; n'ihi na orù-gi agaghi-emere chi ọzọ àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ site n'ub͕u a, ma ọ bu náni Jehova. Ka Jehova b͕aghara orù-gi ihe a; mb͕e onye-nwem nābà n'ulo Rimon ikpọ isi ala n'ebe ahu, mb͕e ya onwe-ya nādabere kwa n'akam, m'we kpọ isi ala n'ulo Rimon, mb͕e m'kpọrọ isi ala n'ulo Rimon, biko, ka Jehova b͕aghara orù-gi n'ihe a.
Gụọ II. NDI-EZE 5
Geere nke a ntị II. NDI-EZE 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI-EZE 5:15-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị