II. JỌN 1:6-9
II. JỌN 1:6-9 IGBOB
Ihu-n'anya ahu bu kwa nka, ka ayi nējeghari dika ihe nile O nyere n'iwu si di. Ihe ahu enyere n'iwu bu nka, dika unu nuru site na mbu, ka unu nējeghari nime ya. N'ihi na ọtutu ndi-nduhie apuwo ba nime uwa, bú ndi nādighi-ekwuputa na Jisus Kraist nābia n'anu-aru. Nka bu onye-nduhie ahu na onye ahu nēmegide Kraist. Lezienu onwe-unu anya, ka unu we ghara ila ọlu ayi luru n'iyì, kama ka unu we nata ugwọ-ọlu zuru ezù. Onye ọ bula nke nāga n'iru, nke nādighi-anọgide kwa nime ozizí nke Kraist-ayi, o nweghi Chineke: onye nānọgide nime ozizí ahu, onye ahu nwere Nna ahu, Ya na Ọkpara-Ya.


