Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI KỌRINT 8:1-7

II. NDI KỌRINT 8:1-7 IGBOB

Ọzọ, umu-nnam, ayi nēme ka unu mara amara Chineke nke enyeworo nime nzukọ Kraist nile nke Masedọnia; na nime ọtutu nnwaputa nke nkpab͕u, nbabiga-ókè nke ọṅù-ha na ob͕eye-ọnu-ntu ha bu babigara ókè rue àkù nke afọ-ofufo-ha. N'ihi na ka ike-ha ra, dika m'nāb͕a àmà, e, kari kwa ike-ha, ka ha nyere dika ha zuputara n'onwe-ha, ha were ọtutu aririọ nāriọ ayi ka ayi nye ha amara nka na nnwekọ ije-ozi anējere ndi nsọ: ha me-kwa-ra nka, ọ bughi dika ayi lere anya, kama ha buru uzọ were onwe-ha nye Onye-nwe-ayi, nye kwa ayi site n'ọchichọ Chineke. Ya mere ayi riọrọ Taitọs, ka, dika ọ malitereri na mbu, ka ọ luzu kwa n'etiti unu amara nka otú a kwa. Ma dika unu babigara ókè n'ihe nile, bú okwukwe, na okwu, na ihe-ọmuma, na inu-ọku-n'obi nile, na ihu-n'anya unu huru ayi, lezienu anya ka unu babiga kwa ókè n'amara nka.