N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe. N'ihi na ayi nāsu udè nime ulo nka ezie, ebe ọ nāgusi ayi ike ka ewere ebe-obibi-ayi nke sitere n'elu-igwe yikwasi ayi n'elu ya: ebe ọ bu na agāhu ayi ndi eyiworo ihe, ndi nāb͕aghi ọtọ. N'ihi na ayi, bú ndi nọ n'ulo-ikwū a, ayi nāsu udè ezie, ebe ọ nānyib͕u ayi; n'ihi na ayi achọghi ka eyipu ayi ya, kama ka eyikwasi ayi ihe n'elu ya, ka ndu we loda ihe puru inwu anwu. Ma Onye luputara ayi ka ewe me otù ihe a bu Chineke, Onye nyere ayi Mọ Nsọ, bú ihe ayi ji mara na agēmezuru ayi ya. Ya mere ayi nēnwe obi-ike mb͕e nile, mata kwa na mb͕e ayi nọ n'ulo n'aru-ayi, ayi anọghi n'ulo n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: (n'ihi na ayi sitere n'okwukwe nējeghari, ọ bughi n'ọhuhu-uzọ); ayi nēnwe obi-ike, ka m'kwuru, ọ di kwa ayi ezi nma kari ka ayi ghara inọ n'ulo n'aru-ayi, ka ayi nọ kwa n'ulo n'ebe Onye-nwe-ayi nọ. N'ihi nka ayi nējisi kwa ike ka ayi we buru ndi di Ya ezi utọ, ma ayi nọ n'ulo ma-ọbu na ayi anọghi n'ulo.
Gụọ II. NDI KỌRINT 5
Geere nke a ntị II. NDI KỌRINT 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI KỌRINT 5:1-9
7 Days
We're always told, "It's just another part of life," but trite sayings don't make the sting of losing a loved one any less painful. Learn to run to God when facing one of life's most difficult challenges.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị