N'ihi na arara ayi onwe-ayi, bú ndi di ndu, nye n'aka ọnwu mb͕e nile n'ihi Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n'anu-aru-ayi nke puru inwu anwu. Ya mere ọnwu nālusi ọlu ike nime ayi, ma ndu nālusi ọlu ike nime unu. Ma ebe ayi nwere otù mọ nke okwukwe ahu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di, Ekwerem, n'ihi ya ka m'kwuru; ayi onwe-ayi kwere kwa, ọ bu kwa n'ihi ya ka ayi nēkwu; ebe ayi matara na Onye ahu Nke mere ka Onye-nwe-ayi Jisus si n'ọnwu bilie, na Ọ gēme kwa ka ayi so Jisus si n'ọnwu bilie, Ọ gēche kwa ayi na unu n'iru Onwe-ya. N'ihi na ihe nile di n'ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n'aka ndi ka n'ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke. N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi. N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi; ebe ayi nādighi-ele ihe anāhu anya, kama ihe anādighi-ahu anya: n'ihi na ihe anāhu anya nādiru nwa oge; ma ihe anādighi-ahu anya di ebighi-ebi.
Gụọ II. NDI KỌRINT 4
Geere nke a ntị II. NDI KỌRINT 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI KỌRINT 4:11-18
7 Days
Have you ever been so tired or defeated in life that you’ve wanted to throw in the towel and give up? The Bible is full of encouragement to persevere and keep going! This 7-day reading plan will refresh you for the journey ahead.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị