Ma ọ buru na onye ọ bula emewo ka o wuta ayi, ọ bughi mu onwem, kama, n'otù akuku (ka m'ghara idọb͕u unu nke-uku) ọ bu unu nile ka o meworo ka o wuta. O zuworo madu di otú a, bú nba nka nke ndi ka n'ọnu-ọgugu nime unu bara ya; ya mere, kama ibara ya nba ọzọ anamachọ ka unu were amara b͕aghara ya kasi kwa ya obi, ka aghara iji ihe-nwuta nke nēwutabiga ya ókè loda madu di otú a n'uzọ ọ bula. N'ihi nka ariọm unu ka unu me ka ihu-n'anya unu huru ya buru ihe di itukwasi obi. N'ihi na ihe mere m'degara unu akwukwọ bu kwa nka, ka m'we mara nnwaputa unu, ma unu bu ndi nāṅa nti rue ihe nile. Ma onye ọ bula unu were amara b͕aghara ya ihe ọ bula, mu onwem were kwa amara b͕aghara ya: n'ihi na ihe mu onwem werewo-kwa-ra amara b͕aghara, ma ọ buru na ewerewom amara b͕aghara ihe ọ bula, ọ bu n'ihi unu ka m'meworo ya n'iru Kraist; ka Setan we ghara irib͕u ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nāmaghi ihe nile ọ nēchèputa.
Gụọ II. NDI KỌRINT 2
Geere nke a ntị II. NDI KỌRINT 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI KỌRINT 2:5-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị