Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI KỌRINT 12:7-9

II. NDI KỌRINT 12:7-9 IGBOB

N'ihi ọkika nke nkpughe ndia-n'ihi ya, ka ewe ghara iwelibigam ókè, enyerem ogwu n'anu-arum, bú mọ-ozi nke Setan, ka o we tiem aka, ka ewe ghara iwelibigam ókè. Ub͕ò atọ ka m'riọrọ Onye-nwe-ayi aririọ bayere ihe a, ka ọ pua n'arum. Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.