II. IHE EMERE 36:22-23
II. IHE EMERE 36:22-23 IGBOB
Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n'ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n'odide-akwukwọ, si, Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda. Ònye nọ n'etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya, ya rigo kwa.

