Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya; o rurughi ala n'iru Jeremaia, bú onye-amuma, onye nēkwu okwu site n'ọnu Jehova. Ọzọ kwa, o nupuru isi n'okpuru eze, bú Nebukadneza, onye mere ka o were Chineke ṅua iyi: o we kwesie olu-ya ike, b͕a obi-ya ume, ka ọ ghara ichigharikute Jehova, bú Chineke Israel. Ndi-isi nile nke ndi-nchu-àjà, na ndi Juda, mekpu-kwa-ra ihe-nmekpu ri nne, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di; ha we merua ulo Jehova nke O doro nsọ nime Jerusalem. Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we zigara ha ozi n'aka ndi-ozi-Ya, nēbili n'isi-ututu, nēzì kwa; n'ihi na O nwere ọmiko n'aru ndi-Ya na n'ebe ebe-obibi-Ya di: ha we nēme ndi-ozi Chineke ka ha buru ihe-ọchì, ha nēlelì kwa okwu-Ya anya, nēme kwa onwe-ha ndi-aghughọ n'ebe ndi-amuma-Ya nọ, rue mb͕e ọnuma Jehova lara elu imegide ndi-Ya, rue mb͕e ngwọta nādighi.
Gụọ II. IHE EMERE 36
Geere nke a ntị II. IHE EMERE 36
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. IHE EMERE 36:11-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị