Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 36:1-21

II. IHE EMERE 36:1-21 IGBOB

Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, me ya eze n'ọnọdu nna-ya nime Jerusalem. Joahaz b͕ara orú arọ na atọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọnwa atọ nime Jerusalem. Eze Ijipt we wezuga ya nime Jerusalem, rie ala ahu nra ọgu talent ọla-ọcha ise na otù talent ọla-edo. Eze Ijipt we me Elaiakim, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem, gugharia ya aha Jehoiakim. Neko we were Joahaz nwa-nne-ya, me ka ọ biarue Ijipt. Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya. Nebukadneza, bú eze Babilon, we rigota imegide ya, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, ime ka o jerue Babilon. Nebukadneza we chiri ufọdu n'ihe ulo Jehova chibata na Babilon, o tiye ha n'ulo uku ya nime Babilon. Ma ihe nile Jehoiakim mere nke fọduru, na ihe-árú-ya nile nke o mere, na ihe achọputaworo imegide ya, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya. Jehoiakin b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze ọnwa atọ na ubọchi iri nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova. Ma n'ọb͕ub͕a arọ, eze, bú Nebukadneza, zìri, me ka ọ biarue Babilon, ya na ihe nile anāchọsi ike nke ulo Jehova, o we me Zedakaia, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem. Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya; o rurughi ala n'iru Jeremaia, bú onye-amuma, onye nēkwu okwu site n'ọnu Jehova. Ọzọ kwa, o nupuru isi n'okpuru eze, bú Nebukadneza, onye mere ka o were Chineke ṅua iyi: o we kwesie olu-ya ike, b͕a obi-ya ume, ka ọ ghara ichigharikute Jehova, bú Chineke Israel. Ndi-isi nile nke ndi-nchu-àjà, na ndi Juda, mekpu-kwa-ra ihe-nmekpu ri nne, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di; ha we merua ulo Jehova nke O doro nsọ nime Jerusalem. Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we zigara ha ozi n'aka ndi-ozi-Ya, nēbili n'isi-ututu, nēzì kwa; n'ihi na O nwere ọmiko n'aru ndi-Ya na n'ebe ebe-obibi-Ya di: ha we nēme ndi-ozi Chineke ka ha buru ihe-ọchì, ha nēlelì kwa okwu-Ya anya, nēme kwa onwe-ha ndi-aghughọ n'ebe ndi-amuma-Ya nọ, rue mb͕e ọnuma Jehova lara elu imegide ndi-Ya, rue mb͕e ngwọta nādighi. O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya. Ihe nile nke ulo Chineke, ihe uku na ihe ntà, na àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke eze na ndi-isi-ya; ihe ndia nile ka ọ chibatara na Babilon. Ha we sure ulo Jehova ọku, kwatu kwa mb͕idi Jerusalem, sure kwa ulo-elu-ya nile n'ọku, na ihe-ya nile anāchọsi ike, ibibi ha. O me ndi fọduru site na mma-agha ka ha je biri na Babilon; ha we ghọrọ ya, ghọ-kwa-ra umu-ya, ndi-orù rue ọbubu-eze ala-eze Peasia: imezu okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia, rue mb͕e ubọchi-izu-ike-ya nile tọsiri ala ahu utọ: ubọchi nile nke ntọb͕ọrọ-n'efu-ya ọ kwusiri ọlu, imezu ọgu arọ atọ na iri.