O rue mb͕e ha nābia, mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, na ndinyom siri n'obobo nile nke Israel puta, ibù abù na ite egwú, izute Sọl, chiri egwú-otiti, were kwa ọṅu, chiri kwa ubọ eji akwara atọ kwe. Ndinyom we zarita onwe-ha, bú ndi nēgwuri egwú, si, Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri, Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise. Iwe Sọl we di ọku nke-uku, okwu a jọ-kwa-ra njọ n'anya-ya; ọ si, Ha enyewo Devid orú nnù na nnù ise, orú nnù na nnù ise, ma ọ bu mu ka ha nyeworo nání nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: ma nke fọduru inye ya bu nání ala-eze. Sọl we nēle Devid anya ọjọ site n'ubọchi ahu ga n'iru.
Gụọ I. SAMUEL 18
Geere nke a ntị I. SAMUEL 18
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. SAMUEL 18:6-9
6 Ụbọchị
Chọpụta, site na ndụ Jeremaya na Devid, na ị dịghịzị na nwata ịmalite imezu nzube gị, jiri ihe i nwere jeere Chineke ozi, ebe ị nọ. Mụta ihe ikwado maka nzube gị pụtara, na-echebe ya pụọ n’aka ndị ga-ebibi ya, ma jikere ibi ndụ nwere nzube, nke na-enye Chineke otuto nke ga-agọzi ụwa.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị