Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 18:12-16

I. SAMUEL 18:12-16 IGBOB

Sọl we nātu egwu Devid, n'ihi na Jehova nọyere ya, ma O siri n'ebe Sọl nọ wezuga Onwe-ya. Sọl we si n'ebe ọ nọ wezuga ya, do ya ka ọ buru ya onye-isi nnù ndikom abua na ọgu iri; o we nāpu nābata kwa n'iru ndi Israel. Devid we nēnwe uche n'uzọ-ya nile; Jehova nọye-kwa-ra ya. Sọl we hu na nwoke ahu bu onye nēnwe uche nke-uku, o we tua ujọ ya. Ma Israel nile na Juda nile nāhu Devid n'anya; n'ihi na ya onwe-ya nāpu nābata kwa n'iru ha.