Ubọchi we rue mb͕e Jonatan nwa Sọl siri nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, nke di n'ofè ọzọ ahu. Ma o gosighi nna-ya. Ma Sọl nānọdu na nsọtu Gibea n'okpuru osisi pomegranate nke di na Migron: ndi nọ n'aka-ya ra ka nnù ndikom na ọgu iri; Ahaija, nwa Ahaitub, nwa-nne Ikabod, nwa Finehas, nwa Ilai, bú onye-nchu-aja Jehova na Shailo, nọ kwa, ọ nēyi ephod. Ndi ahu amaghi kwa na Jonatan ejewo. Ma n'etiti ngabiga abua ahu, nke Jonatan chọrọ isi na ha gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, otú ọnu nkume di elu di n'otù ofè, otù ọnu nkume di elu di kwa n'ofè ọzọ: aha otù bu Bozez, aha nke-ọzọ bu Sene. Otù ọnu bu ogidi n'akuku Ugwu na ncherita-iru Mikmash, nke-ọzọ n'akuku Ndida na ncherita-iru Geba. Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n'ihi na ihe-nb͕ochi adighi n'ebe Jehova nọ izọputa site n'iwere ọtutu madu ma-ọbu site n'iwere madu ole-na-ole.
Gụọ I. SAMUEL 14
Geere nke a ntị I. SAMUEL 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. SAMUEL 14:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị