Nehash, bú onye Amon, we rigota, ma ulo-ikwū-ya imegide Jebesh-gilead: ndikom nile nke Jebesh we si Nehash, Ka ayi na gi b͕a ndu, ayi gēfè kwa gi òfùfè. Nehash, bú onye Amon, we si ha, Na nka ka mu na unu gāb͕a ndu, n'irukpọ unu anya aka-nri nile; m'gātukwasi kwa ya n'aru Israel nile ka ọ buru ihe-ita-uta. Ndi-okenye Jebesh we si ya, Ra ayi aka ubọchi asa, ka ayi we zisa ndi-ozi n'ókè-ala nile nke Israel: ọ buru kwa na ọ dighi onye nāzọputa ayi, ayi gāpukuru kwa gi. Ndi-ozi ahu we biarue Gibea nke Sọl, kwue okwu ndia na nti ndi Israel: ndi Israel nile we welie olu-ha kwa ákwá. Ma, le, Sọl biara, nēso ìgwè ehi si n'ubi; Sọl we si, Gini nēme ndi Israel na ha nākwa ákwá? Ha we kọrọ ya okwu nile nke ndikom Jebesh.
Gụọ I. SAMUEL 11
Geere nke a ntị I. SAMUEL 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. SAMUEL 11:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị