ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi. N'ihi na, Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya, Na ihu ezi ubọchi, Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ: Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe; Ya chọ udo, b͕aso kwa ya. N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume, Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di: Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ. Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n'obi n'iso ezi ihe? Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri; kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu: ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya.
Gụọ I. PITA 3
Geere nke a ntị I. PITA 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. PITA 3:9-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị