Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n'ibi-obi nwunye-ha rita ha n'urù n'ebe anēkwughi okwu; mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu. Ndi ichọ-nma-ha ka ọ ghara ibu ichọ-nma ahu nke aru nke bu ikpa isi, na iyikwasi ihe ọla-edo, ma-ọbu iyikwasi ọtutu uwe; kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n'uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n'anya Chineke. N'ihi na otú a ka ndinyom ahu ndi di nsọ, ndi nēle anya Chineke, nāchọ kwa onwe-ha nma n'oge gara aga, nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha: dika Sera ṅara Abraham nti, nākpọ ya onye-nwe-ya: onye emere unu ka unu buru umu-ya, ma ọ buru na unu eme ezi ihe, ghara kwa itu egwu site n'ujọ ọ bula.
Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.
Ma n'ikpe-azu, nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n'anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala: ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi. N'ihi na,
Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya,
Na ihu ezi ubọchi,
Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ,
Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ:
Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe;
Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.
N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume,
Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di:
Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.