Nke obi nātọ unu utọ nke-uku nime ya, ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n'ọnwunwa di iche iche nwa oge ub͕u a, ma asi na ọ di nkpà, ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist: Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto: ebe unu nānata ihe okwukwe-unu gēweta, bú nzọputa nke nkpuru-obi-unu.
Gụọ I. PITA 1
Geere nke a ntị I. PITA 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. PITA 1:6-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị