Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu. Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya. Ihe-oriri Solomon nke diri otù ubọchi bu kwa orú ọtùtù ọka na iri nke utu ọka flour, na ọgu ọtùtù ọka atọ nke utu ọka; ehi iri mara abuba, na orú ehi site n'ebe anāzù anu, na ọgu aturu ise, nāgughi ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ọkuku emere ka ha ma abuba. N'ihi na ya onwe-ya nwere ike n'aru ndi nile bi n'ofè Osimiri, site na Tifsa we rue Geza, bú n'aru eze nile n'ofè Osimiri: o nwe-kwa-ra udo site n'ofè ọzọ nile di ya buruburu. Juda na Israel we biri na ntukwasi-obi, nwoke ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya, site na Dan we rue na Biasheba, ubọchi nile nke Solomon.
Gụọ I. NDI-EZE 4
Geere nke a ntị I. NDI-EZE 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI-EZE 4:20-25
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị