Elaija we si Ehab, Rigo, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; n'ihi na olu ùzù oké miri-ozuzo nāda. Ehab we rigo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. Ma Elaija rigoro n'elu ugwu Kamel; o ruru ala, tiye iru-ya n'etiti ikperè-ya abua. Ọ si nwa-okorọbia-ya, Biko, rigo, legide anya n'uzọ oké osimiri. Ọ rigo, legide anya, si, Ọ dighi ihe ọ bula di. Ọ si, Jeghachi ub͕ò asa. O rue, na nke ub͕ò asa, na ọ siri, Le, igwe-oji, nke di ntà dika ọbu-aka madu, nēsi n'oké osimiri rigoputa. Ọ si, Rigo, si Ehab, Dozie ub͕ọ-ala-gi, rida, ka miri-ozuzo we ghara ib͕ochi gi. O rue, na nwa mb͕e ntà, na elu-igwe jiri nji n'igwe-oji na ifufe, oké miri-ozuzo di uku we di. Ehab we nọkwasi n'ub͕ọ-ala, la na Jezreel.
Gụọ I. NDI-EZE 18
Geere nke a ntị I. NDI-EZE 18
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI-EZE 18:41-45
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị