Ọ si ya, Nyem nwa-gi nwoke. O we kuputa ya n'obi-ya, kugo ya n'ime-ulo-elu, ebe ya onwe-ya nānọdu, ọ tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya. Ọ kpọkue Jehova, si, Jehova, bú Chinekem, ọ̀ bu kwa nwayi a di-ya nwuru, nke mu onwem nānọ n'ulo-ya dika ọbìa, ka I mejọworo, n'ime ka nwa-ya nwoke nwua? O setia onwe-ya n'aru nwata ahu ub͕ò atọ, kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, bú Chinekem, ka nkpuru-obi nwata nka biaghachi nime ya. Jehova we ge nti olu Elaija; nkpuru-obi nwata ahu we biaghachi nime ya, ọ we di ndu. Elaija we kuru nwata ahu, si n'ime-ulo-elu ahu kudata ya n'ulo, nye ya nne-ya: Elaija we si, Le, nwa-gi nādi ndu. Nwayi ahu we si Elaija, Ub͕u a amawom nka na onye nke Chineke ka i bu, na okwu Jehova bu kwa ezi-okwu n'ọnu-gi.
Gụọ I. NDI-EZE 17
Geere nke a ntị I. NDI-EZE 17
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI-EZE 17:19-24
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị