Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke: ọzọ onye ọ bula nke nāhu Onye ahu Nke muru n'anya, ọ nāhu kwa onye ahu nke amuworo site na Ya n'anya. Nime nka ka ayi mara na ayi nāhu umu Chineke n'anya, mb͕e ọ bula ayi nāhu Chineke n'anya, me kwa ihe nile O nyere n'iwu. N'ihi na nka bu ihu-n'anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n'iwu: ihe O nyere n'iwu adighi kwa arọ́. N'ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi. Ma ònye bu onye nēmeri uwa, ma-ọbughi onye ahu nke kwere na Jisus bu Ọkpara Chineke?
Gụọ I. JỌN 5
Geere nke a ntị I. JỌN 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. JỌN 5:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị