Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke: ọzọ onye ọ bula nke nāhu Onye ahu Nke muru n'anya, ọ nāhu kwa onye ahu nke amuworo site na Ya n'anya. Nime nka ka ayi mara na ayi nāhu umu Chineke n'anya, mb͕e ọ bula ayi nāhu Chineke n'anya, me kwa ihe nile O nyere n'iwu. N'ihi na nka bu ihu-n'anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n'iwu: ihe O nyere n'iwu adighi kwa arọ́. N'ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi. Ma ònye bu onye nēmeri uwa, ma-ọbughi onye ahu nke kwere na Jisus bu Ọkpara Chineke? Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu. Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāb͕a àmà, n'ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu. N'ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu. Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n'ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya. Onye kwere n'Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime ya: onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha; n'ihi na o kweghi n'àmà ahu nke Chineke b͕aworo bayere Ọkpara-Ya. Àmà ahu bu nka, na Chineke nyere ayi ndu ebighi-ebi, ndu ahu di nime Ọkpara-Ya. Onye nwere Ọkpara ahu nwere ndu ahu; onye nēnweghi Ọkpara Chineke enweghi ndu ahu.
Gụọ I. JỌN 5
Geere nke a ntị I. JỌN 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. JỌN 5:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị