nime nka ka ayi ma-kwa-ra na ayi amawo Ya, ma ọ buru na ayi edebe ihe nile O nyere n'iwu. Onye, nāsi, Amawom Ya, ma ọ dighi-edebe ihe nile O nyere n'iwu, ọ bu onye-ugha, ezi-okwu adighi kwa nime onye ahu: ma onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihunanya Chineke zue okè n'ezie. Nime nka ka ayi mara na ayi nọ nime Ya: onye nāsi na ọ nānọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri. Ndi m'huru n'anya, ọ dighi ihe ọhuu enyere n'iwu nkem m'nēdegara unu, kama ihe ochie enyere n'iwu nke unu nwere site na mbu: ihe ochie ahu enyere n'iwu bu okwu ahu nke unu nuru. Ọzọ, ihe ọhu enyere n'iwu ka m'nēdegara unu, ya bu ihe nke bu ezi-okwu nime Ya na nime unu; n'ihi na ọchichiri ahu nāgabiga, ezi ìhè ahu nāmu kwa ub͕u a. Onye nāsi na ya nọ n'ìhè ahu, ma ọ nākpọ nwa-nna-ya asì, ọ nānọ n'ọchichiri ahu rue ub͕u a. Onye nāhu nwa-nna-ya n'anya nānọgide n'ìhè ahu, ọ dighi ihe nēme ka madu ma n'onyà di nime ya. Ma onye nākpọ nwa-nna-ya asì nọ n'ọchichiri ahu, nējeghari kwa nime ọchichiri ahu, ọ mataghi kwa ebe ọ nāga, n'ihi na ọchichiri ahu mere ka anya-ya kpue ìsì.
Gụọ I. JỌN 2
Geere nke a ntị I. JỌN 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. JỌN 2:3-11
2 Weeks
Jesus Himself said anyone who loves Him will obey His teaching. No matter what it costs us personally, our obedience matters to God. The "Obedience" reading plan walks through what the Scriptures say about obedience: How to maintain a mindset of integrity, the role of mercy, how obeying frees us and blesses our lives, and more.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị