Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n'uwa, n'anya. Ọ buru na onye ọ bula ahú uwa n'anya, ihu-n'anya nke Nna-ayi adighi nime ya. N'ihi na ihe nile nke di n'uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esiteghi na Nna-ayi, kama o sitere n'uwa. Uwa nāgabiga kwa, ya na agu ihe ọjọ ya: ma onye nēme ihe Chineke nāchọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi. Umu-ntakirim, ọ bu oge hour ikpe-azu: dika unu nukwara na otù onye nke nēmegide Kraist nābia, ọbuná ub͕u a ọtutu ndi nēmegide Kraist aputawo; nke ayi sitere na ya mara na ọ bu oge hour ikpe-azu. Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi. Unu onwe-unu nwe-kwa-ra otite-manu site n'Onye Nsọ ahu, unu mata-kwa-ra ihe nile.
Gụọ I. JỌN 2
Geere nke a ntị I. JỌN 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. JỌN 2:15-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị