Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem. Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi: ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie. Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela. Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru.
Gụọ I. NDI KỌRINT 6
Geere nke a ntị I. NDI KỌRINT 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI KỌRINT 6:11-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị