Ka madu nāgu ayi otú a, dika ndi nējere Kraist ozi, ndi bu kwa ndi nāchi èzí-na-ulo n'ihe-omimi nke Chineke. N'ebe a ihe anāchọ kwa n'aka ndi nāchi èzí-na-ulo bu, ka ahu onye ọ bula na o kwesiri ntukwasi-obi. Ma ọ burum ihe dikarisiri ntà ka unu, ma-ọbu ubọchi ikpé nke madu, kpem ikpé: é-è, ekpeghi m ọbuná onwem ikpé. N'ihi na ọ dighi ihe ọ bula m'mara megide onwem; ma ọ bughi na nka ka aguworom n'onye ezi omume: kama Onye nēkpem ikpé bu Onye-nwe-ayi. Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n'ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n'otù n'otù gēnwe kwa otuto-ha site n'aka Chineke.
Gụọ I. NDI KỌRINT 4
Geere nke a ntị I. NDI KỌRINT 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI KỌRINT 4:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị