Ihu-n'anya nwere ogologo-ntachi-obi, o nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n'anya adighi-ekwo ekworo; ihu-n'anya adighi-anya isi, ọ dighi-afuli onwe-ya elu, ọ dighi-eme ihe nādighi nma n'anya, ọ dighi-achọ ihe nke aka ya, oké iwe adighi-ewe ya, ọ dighi-agu ihe ọjọ emere ya; ọ dighi-aṅuri ọṅu nime ajọ omume, ma ọ nēso ezi-okwu ṅurikọ ọṅu; ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n'ihe nile. Ihu-n'anya adighi-ada mb͕e ọ bula: ma ọ buru na ibu-amuma di, agēme ka ha ghara idi irè; ọ buru kwa na asusu di iche iche di, ha gāgwu; ọ buru kwa na ihe-ọmuma di, agēme ka ọ ghara idi irè. N'ihi na ayi mara na nkpirikpi, ayi nēbu kwa amuma na nkpirikpi: ma mb͕e ọ bula ihe nke zuru okè gābia, agēme ihe, nke di na nkpirikpi ka ọ ghara idi irè. Mb͕e m'buri nwa ọhu, anamekwu dika nwa ọhu, anamatukwasi uche n'ihe dika nwa ọhu, anamagu ihe dika nwa ọhu: ub͕u a mb͕e m'ghọworo okenye, emewom ka omume nwa ọhu ghara idi irè. N'ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m'mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m'gāmazu dika amazu-kwa-ram. Ma ub͕u a ka okwukwe, olile-anya, ihu-n'anya, ihe atọ ndia, nānọgide; ma nke kachasi n'ihe ndia bu ihu-n'anya.
Gụọ I. NDI KỌRINT 13
Geere nke a ntị I. NDI KỌRINT 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. NDI KỌRINT 13:4-13
5 Days
By focusing on our marriage within the context of Scripture, we give God the opportunity to reveal new insights about our relationship and strengthen our bond. This Plan features a focused passage of Scripture and quick thoughts each day to initiate discussion and prayer with your spouse. This five-day plan is a short-term commitment to help you invest in your lifelong relationship. For more content, check out finds.life.church
7 Days
Whether we suffer emotional or physical wounds, forgiveness is the cornerstone of the Christian life. Jesus Christ experience all kinds of unfair and unjust treatment, even to the point of a wrongful death. Yet in his final hour, he forgave the mocking thief on the other cross and his executioners.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị