O rue, n'abali ahu, na okwu Chineke ruru Netan nti, si, Je, si Devid, bú orùm, Otú a ka Jehova siri, Gi onwe-gi agaghi-ewurum ulo ibu ebe M'gēbi: n'ihi na ebighm n'ulo site n'ubọchi M'mere ka Israel rigota, rue ta; kama esim n'otù ulo-ikwū ba n'ulo-ikwū ọzọ, si kwa n'otù ebe-obibi ba n'ebe-obibi ọzọ. N'ebe nile nke M'nējeghari n'etiti Israel nile, ọ̀ di okwu M'gwara otù nime ndi-ikpe Israel, nke M'nyere iwu izù ndim, si, N'ìhi gini ka unu nēwurughm ulo cedar? Ma ub͕u a otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwè ewu na aturu, kuru gi, ka i buru onye-ndú ndim, bú Israel: M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa.
Gụọ I. IHE EMERE 17
Geere nke a ntị I. IHE EMERE 17
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: I. IHE EMERE 17:3-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị