Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Zefanaya Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Zefanaya onye amụma buru amụma ya na Juda tupu ndị Babilọn adọta ndị bi nʼime ya nʼagha. Ọ rụrụ ọrụ ibu amụma na nkwusa ya nʼoge ọchịchị Josaya eze Juda. Eze Josaya gbalịrị idozi ihe ụfọdụ na-emebi emebi, ma ndị Juu bi nʼoge ahụ daghachiri azụ na-ebikwa ndụ ọjọọ ha. Ọ bụ nʼọnọdụ ndụ ọjọọ ha ka ndị Babilọn ji dọta Jerusalem nʼagha. Zefanaya gosiri na nkwusa ya na Chineke bụ onye ezi omume, gosikwa na ndị Juda, na obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie ha megide Chineke.
Usoro e si dee ya:
Ọbịbịa nke ikpe ọmụma Chineke 1:1–2:3
Ikpe ọmụma dịrị Jerusalem, na mba ndị ọzọ 2:4–3:8
Ngọzị ga-emesịa dịrị Juda 3:9-20

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Zefanaya Ihe dị nʼime ya: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye