Mgbe ahụ, o gosiri m Joshua onyeisi nchụaja ka ọ na-eguzo nʼihu mmụọ ozi nke ONYENWE ANYị, na ekwensu ka ọ na-eguzo nʼaka nri ya ibo ya ebubo. ONYENWE ANYị sịrị ekwensu, “ONYENWE ANYị basiere gị mba ike, gị ekwensu. ONYENWE ANYị, onye họpụtara Jerusalem, basiere gị mba ike. Nwoke a, ọ bụghị ọlọkọ ọkụ na-ere ere, nke e si nʼime ọkụ gụpụta?” Mgbe Joshua guzo nʼihu mmụọ ozi ahụ, uwe ya ruru unyi. Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ahụ guzo ya nʼihu, “Yipụnụ ya uwe a ruru unyi.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya okwu sị, “Lee, ewepụla m mmehie gị, ma ugbu a, aga m eyikwasị gị uwe mmemme ndị a.”
Gụọ Zekaraya 3
Geere nke a ntị Zekaraya 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Zekaraya 3:1-4
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị