Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie. Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye Chineke otuto maka ebere ya, dịka e dere ya,
“Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ,
aga m abụ abụ nye aha gị.”
O kwukwara ọzọ sị,
“Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.”
Ọzọkwa,
“Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile,
ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.”
Ọzọkwa, Aịzaya na-asị,
“Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ,
onye nke ga-ebili ịchị mba niile,
ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.”
Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.
Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe. Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m, abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ.
Nʼihi ya, ana m anya isi nʼime Kraịst Jisọs banyere ọrụ m na-arụrụ Chineke. Agaghị m anwa anwa kwuo okwu banyere ihe ọzọ karịakwa ihe ndị ahụ Kraịst rụpụtara site nʼaka m, bụ idubata ndị mba ọzọ, ime ka ha rube isi nye Chineke, site nʼokwu ọnụ m na ihe m rụrụ, nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke Chineke. Ya mere, site na Jerusalem ruo Ilirikom, ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma Kraịst. Ọchịchọ obi m mgbe niile bụ ikwusa oziọma ahụ nʼebe ọbụla ndị mmadụ na-anụtụbeghị ihe banyere Kraịst, ka m ghara ịbụ onye na-ewukwasị ihe nʼelu ntọala nke onye ọzọ tọrọ, ma dịka e dere ya,
“Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ,
ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.”