Ndị Rom 11:25-36
Ndị Rom 11:25-36 BIU
Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru. Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya, “Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa. Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.” Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha. Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke. Unu onwe unu ndị na-enupuru Chineke isi na mbụ, anatala ebere ya ugbu a, nʼihi nnupu isi ha. Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu. Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya. Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu! Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile, ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta. “Onye maara uche Onyenwe anyị? Ma ọ bụ onye bụ onye ahụ na-enye ya ndụmọdụ?” “Onye burula ụzọ nye Chineke ihe, nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?” Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen.

