Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 3:1-5

Abụ Ọma 3:1-5 BIU

O ONYENWE ANYị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m. Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị, “Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela Ma gị, ONYENWE ANYị bụ ọta na-ekpuchi m; I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ. Etikuru m ONYENWE ANYị mkpu akwa, ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela Edinara m ala, hie ụra, ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na ONYENWE ANYị na-eche m nche.