Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 119:41-80

Abụ Ọma 119:41-80 BIU

O ONYENWE ANYị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi. Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m, nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya. Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile. Cheta okwu i nyere ohu gị, nʼihi na i nyela m olileanya. Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m. Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m. O ONYENWE ANYị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, ha na-ewetara m nkasiobi. Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, ndị gbakụtara iwu gị azụ. Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m ebe ọbụla m na-anọ. Nʼabalị, o ONYENWE ANYị, ana m echeta aha gị, aga m edebekwa iwu gị. Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi. O ONYENWE ANYị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile. Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị. Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile. Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi. A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị. Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi. Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị. O ONYENWE ANYị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; kuziere m iwu gị niile. Meere ohu gị ihe ọma dịka okwu gị si dị, o ONYENWE ANYị. Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile. Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi. I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile. Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị. Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị. Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile. Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile. Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị. O ONYENWE ANYị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ. Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị. Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m. Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile. Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m.