Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 119:153-176

Abụ Ọma 119:153-176 BIU

Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị. Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị. Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile. O ONYENWE ANYị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị. Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị. Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi. Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o ONYENWE ANYị, dịka ịhụnanya gị si dị. Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere, ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi. Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ. Ana m echere nzọpụta gị, o ONYENWE ANYị, na-agbasokwa iwu gị niile. Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu. Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile. Ka akwa m ruo gị ntị, o ONYENWE ANYị; nye m nghọta dịka okwu gị si dị. Ka arịrịọ m ruo gị ntị; gbapụta m dịka nkwa gị si dị. Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile. Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. Nọọ na njikere oge niile inyere m aka, nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile. Ana m ele anya nzọpụta gị, o ONYENWE ANYị, iwu gị bụ ihe na-amasị m. Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume. Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu, chọọ ohu gị, nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.