Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime Kraịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a. Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-arịọ gị arịrịọ a. Biko, arịọ m gị nʼisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ. Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru. Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi m ka m na-ezitere gị. Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma. Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta. Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi. Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime Onyenwe anyị.
Gụọ Fịlịmọn 1
Geere nke a ntị Fịlịmọn 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Fịlịmọn 1:8-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị