Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọbadaya Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Ihe dị nʼakwụkwọ a bụ amụma Ọbadaya buru megide Edọm. Edọm bụ obodo ahụ nyeere ndị iro Juda aka laa Jerusalem nʼiyi. Ndị obodo Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, nwanne Jekọb, onye bụ nna nna ochie ndị Izrel. Ọbadaya kwuru okwu megide ihe ọjọọ ahụ Edọm mere. Nʼihi na kama ndị Edọm ga-apụta nyere ndị Izrel aka ịlụso ndị iro ha ọgụ, ha gara nyere ndị iro ahụ aka imegide ndị Izrel, sorokwa ha kwakọọ akụnụba ndị Izrel. Nʼihi ihe ọjọọ ndị a ha mere, ikpe ọmụma Chineke ga-abịakwasị ha.
Usoro e si dee ya:
Amụma banyere mbibi Edọm: 1-9
Ihe ọjọọ Edọm mere: 10-14
Nlọghachi nke ndị a dọtara nʼagha: 15-21

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Ọbadaya Ihe dị nʼime ya: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye