Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha sị, “Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla asị unu ihe ọbụla, unu ga-asị ha, ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ha ngwangwa.” E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. “Gwanụ ada Zayọn sị, ‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu, ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ ” Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee. Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha. Ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Ndị ọzọ gbuturu alaka osisi, tụsaa ha nʼụzọ nʼihu ya. Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị: “Hozanna dịrị Nwa Devid!”
Gụọ Matiu 21
Geere nke a ntị Matiu 21
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Matiu 21:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị