Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja ONYENWE ANYị. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha. Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na ONYENWE ANYị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị. Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.
Gụọ Malakaị 2
Geere nke a ntị Malakaị 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Malakaị 2:13-15
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị