Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ ONYENWE ANYị fee chi ndị ọzọ! Ọ bụ ONYENWE ANYị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee. Ọ bụ ONYENWE ANYị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.”
Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife ONYENWE ANYị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile. Ọ bụrụ na unu agbakụta ONYENWE ANYị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.”
Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama ONYENWE ANYị ka anyị ga-efe ofufe.”
Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife ONYENWE ANYị ofufe.”
Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.”
Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere ONYENWE ANYị Chineke Izrel isi.”
Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe ONYENWE ANYị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”
Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe. Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ ONYENWE ANYị.
Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke ONYENWE ANYị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.”
Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha.
Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo ONYENWE ANYị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri. E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera, nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash.
Ndị Izrel fere ONYENWE ANYị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke ONYENWE ANYị rụụrụ ndị Izrel.
Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef.
Elieza nwa Erọn, nwụkwara. E liri ya nʼala ugwu ugwu ndị Ifrem, na Gibea, obodo e nyere nwa ya bụ Finehaz.