Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Aịzaya 2:1-4

Aịzaya 2:1-4 BIU

Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem. Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu ONYENWE ANYị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu ONYENWE ANYị ga-esitekwa na Jerusalem pụta. Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile, doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge; kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.

Onyonyo Amaokwu Gasị maka Aịzaya 2:1-4

Aịzaya 2:1-4 - Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem.

Nʼụbọchị ikpeazụ,
ugwu nke ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, ga-abụ nke eguzobere
dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile,
a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile,
mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.
Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa,
“Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu ONYENWE ANYị,
ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb.
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile,
ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”
Iwu ga-esi na Zayọn pụta,
okwu ONYENWE ANYị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.
Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile,
doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche.
Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge;
kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi.
Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,
maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.