Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Habakuk Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Habakuk buru amụma ya nʼala Juda tupu ndị Babilọn adọta ndị bi nʼime ya nʼagha. Nʼoge a, e mere ka ọ hụ ụdị ịla nʼiyi na-aga ịbịakwasị ndị ya. Nʼihi ya, Habakuk bidoro ịjụ ụzọ ajụjụ abụọ. Nke mbụ, ọ chọrọ ịmata ihe mere Chineke ji gba nkịtị mgbe ihe ọjọọ na-aba ụba nʼala Juda. Nke abụọ, ọ chọrọ ịghọta ihe mere Chineke ji kpebie iji mba a maara dịka ndị mmehie mere ngwa ọrụ ya, ịta ndị nke ya ahụhụ. Chineke zara Habakuk ajụjụ abụọ ndị a. Ma o mere karịa nke a, o mere ka Habakuk hụ ya anya. Anya Habakuk hụrụ Chineke gbakwara Habakuk ume iguzosi ike.
Usoro e si dee ya:
Mmehie na ahụhụ so ya 1:1-11
Chineke na ndị Babilọn 1:12–2:20
Abụ mmeri nke Habakuk 3

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Habakuk Ihe dị nʼime ya: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye