Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem. Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu ka onye ozizi na-ekwu. Ihe na-enweghị isi ka ihe niile bụ. Ihe niile bụ nnọọ ihe efu. Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ? Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa, ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi. Anyanwụ na-awa, na-adakwa, ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta. Ifufe na-efe gaa na ndịda; feekwa gburugburu gaa nʼugwu, ọ na-efegharị gburugburu ebe niile; na-efe na-enweghịkwa nsọtụ. Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri ma oke osimiri ejughị eju. Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a, malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri. Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ; ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ. Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị. Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị. Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ. Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ.
Gụọ Ekiliziastis 1
Geere nke a ntị Ekiliziastis 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ekiliziastis 1:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị