Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Emọs Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Emọs buru amụma ya nʼoge Hosiya na Aịzaya, na Maika na-ebu amụma nke ha. Ọ bụ nʼIzrel, alaeze ndị Juu ahụ dị nʼakụkụ ugwu nke ala ahụ, ka ọ nọ buo amụma ndị a. Ma ọ bụkwanụ na Juda ka a nọ mụọ ya. Akwụkwọ Emọs ji ịdọ aka na ntị maka ikpe ọmụma bido. O dere ihe banyere ikpe ọmụma ga-abịakwasị mba dị iche iche, deekwa maka ikpe ọmụma nke ga-abịakwasị ala Izrel. O kwuru okwu megide mmehie dị iche iche ndị bi nʼala ahụ na-eme, dị ka mmehie ekpeghị ikpe ziri ezi, na mmehie iri ngarị, na nke anya ukwu, na nke ikpere arụsị. O sitere nʼọhụ dị iche iche ọ hụrụ dọọ ndị Izrel aka na ntị. Ma o nweghị olileanya ọbụla na ndị Izrel ga-esite nʼajọ omume ha chegharịa.
Usoro e si dee ya:
Nkọwa maka onye Emọs bụ 1:1-2
Ikpe ọmụma dịrị mba dị iche iche na Izrel 1:3–2:16
Okwu banyere ikpe ọmụma na-abịa 3–6
Ọhụ ise Emọs hụrụ 7:1–9:10
Ngọzị nke oge dị nʼihu 9:11-15

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Emọs Ihe dị nʼime ya: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye